Igbo News

Zamfara emefuola Nde naira iri asatọ na atọ maka ehi eji mee Sallah

Views

Onye ọchịchị ndi Zamfara Steeti bụ Bello Matawalle eweputala nde naira iri asatọ na atọ ejiri zụọ ehi nari asaa na iri ise maka emume Eid-el-fitri.

O kwuru na ehi ndi a bụ nke e gburu nye ndi ụwa na-atu n’ọnụ, ndi enweghi nne na nna na ndi na-enweghi di na local gọọmentị iri na anọ dị na steeti ahụ.

Onye kwuru okwu a bụ Idris Gusua, bụ onye na-ekwuchitere steeti okwu. Ọ sịrị na ụdị emume so na ụzọ gọọmentị steeti si emeba ọdị mma ndi mmadu.

Ehi ndi a egburu ka ekere ka onye ọ bụla nwee ike ime emume ‘Eid-el-fitri’ na-agbanyeghi otu ọnọdụ enweghi ego na nchebe siri dị na steeti.

Matawalle rịọrọ ndi bi na steeti ka ha were ohere emume a kpee ekpere maka udo na mmepe na obodo a.

Leave a Reply