Igbo News

Xenophobia: onye ozi Buhari eruola South Africa

Views

Onye ozi pụrụ iche nke Onyeisi ala Muhammadu Buhari dunyere South Africa maka mwakpo ndi Naijiria eruola Johannesburg, South Africa.

Onye ozi a bụ Onye ntụziaka National Intelligence Agency, Ahmed Abubakar, onye e kwuru ruru South Africa na mgbede Tọzde.

E kwukwara na ndi ọrụ nke Nigeria High Commission nabatara ya na South Africa.

Ọ ga-enwe nzuko; ya na Onyeisi ala South Africa, Cyril Ramophosa na Pretoria, na Fraide, ma nyekwa ya ozi Buhari.

Atụrụ anya na Abubakar ga-egosi iwe ndi Naijiria maka ụdị omume a na-emeso ndi Naijiria na South Africa.

Leave a Reply