Igbo News

Xenophobia: Ndiisi ụlọ ọrụ MTN e gosila ọnọdụ ha gbasara mwakpo South Africa

Views

Ndiisi MTN Nigeria, na Tọzde, gosiri mwute ha ma katọọ mwakpo na mmebisi ihe enwe enwe ndi Naijiria na South Africa.

Onyeisi oche ndiisi ụlọ ọrụ, Mz. Ernest Ndukwe, katọkwara mwakpo mmegwara nke Naijiria ji emegide ụlọ ọrụ nke South Africa na Naijiria.

Ndukwe kwuru nke a n’akwụkwọ ozi nke Mz. Onome Okwah, onye ọrụ MTN na-ahụ maka ọha, nyere ndi nta akụkọ na Lagos.

Ndukwe kwuru, ‘Anyị anabataghị mmesike na mwakpo n’ụdị ọ bụla. Anyi na-egosikwa obi ọmiiko ebe ọ dị ukwuu maka ndi ihe a metụtara ma na-arịọkwa ndi Naijiria, South Africa na obodo ndi ọzọ, ka ha kwụsi ọgụ na mgba, ma jisie ike tikọta isi ọnụ ma chọwa ewu ojii mgbe chi ka dị’.

Leave a Reply