FeaturedIgbo News

Xenophobia: Gọọmentị South Africa arịọ mgbaghara

Views

Gọọmentị nke South Africa egosila mwute ha maka otu ndi National Association of Nigeria Students si eyi ndi South Africa bi na Naijiria egwu.

Obodo a kwuru nke a site n’ọnụ Counsellor na-ahụ maka Political Affairs na South African High Commission nke dị n’Abuja. Anna-Maria Jojozi kwuputara nke a na Sọnde. O kwuru na ndi NANS ikwu na ha ga-emechi ahịa ndi South Africa na Naijiria gosiri na ha o nweghi ihe ha kpọọrọ mmekọrịta Naijiria na South Africa.

Jojozi kwuru na onye na-anọchi anya High Commission nke South Africa, Mz. Bobby Moroe, enweela nzukọ, ya na ndi ọrụ gọọmentị nke Naijiria wee na-ekwu na ha ga-agba mbọ hụ na ndụ na ihe enwe enwe nke ndi Naijiria bi na South Africa bụ nke a ga-echekwa echekwa.

Leave a Reply