Igbo News

Xenophobia: FG ga-ebido ịkpọpụta ndi mmadu na South Africa taa

Views

Ndi National Union South Africa na Tuzde, kwuru na akwụsịla mwakpo ndi mba ọzọ na South Africa, mana egwu ka ji onye ọ bụla.

Onyeisi NUSA, Adetola Olubajo, onye gwara ndi nta akụkọ nke a site n’ajụjụọnụ ekwenti, kwuru na ọtụtụ ụlọ ahia nke ndi mba ọzọ nwe na South Africa ka mechiri emechi n’ihi egwu na ndi South Africa nwere ike iwakpo ha ọzọ.

O kwuru na ụfọdụ ụlọ ahịa bụ ndi akpọrọ ọkụ ma zufusie ngwa ahia dị n’ime ya. Ya mere, ndi nwe ụlọ ahịa ndi ahụ ga-ebido n’isi ịrụgharị ụlọ ahịa ha.

Maka ịkpọpụ ndi Naijiria, o kwuru na mmadu nari isii na iri na anọ edeela aha ha maka mkpọpụ, tinyekwara mmadu nari atọ na iri abụọ ndi a ga-akpọpụ taa ma ọ kụọ elekere itoolu nke ụtụtụ.

Olubajo rịọkwara ndi Naijiria na ndi nwere ọdụ ụgbọelu ka nye aka n’ụzọ ọ bụla ka akpọpụta ndi choro ịlọta.

Ndi Air Peace n’aka nke ọzọ, kwuru na ụgbọelu ha hapụrụ Naijiria na Tuzde, elekere abụọ nke ehihie; ma kwuo na ọ ga-eru South Africa na Wenesde, n’ihe dika elekere abụọ nke ehihie. Ha kwukwara ha emume gbasara mkpọpụ a ga-akwụsị na Tọzde.

Leave a Reply