Igbo News

Xenophobia: FG ga-akpọpụta mmadu nari atọ na iri na itolu na South Africa na Tuzde

Views

E kwuola na Gọọmentị etiti ga-akpọpụta mmadu ruru nari atọ na iri na itolu site na South Africa na Tuzde.

Ndi Punch chọpụtara na Sọnde na e meela ihe niile e kwesiri ime iji hụ na emume a gara ọfụma karia nke e mere na Wenesde.

Gọọmenti etiti na Wenesde kpọpụtara mmadu otu nari na iri asatọ na asaa site na South Africa maka mwakpọ ha na-enweta n’aka ndi South Africa.

Njem ha na Wenesde bụ nke gburu oge maka na ndi South Africa kwuru na ụfọdụ ndi Naijiria enweghi akwụkwọ zuru oke maka njem ha.

N’ajụjụ ọnụ a gbara Onyeisi oche Nigeria in Diaspora Commission, Abike Dabiri-Erewa, o kwuru na e nyela ndi Naijiria akwụkwọ njem niile nke ha ga-eji eme njem ha.

O kwuru na ha edebala aha mmadu nari atọ na iri na itolu maka njem ha ga-eme echi mana ndi mmadu ka na-edekwa aha maka nlọta. Ya mere, ha ka na-ele anya mmadu nari atọ na iri na itolu ọzọ.

Nigeria High Commission na South Africa kwukwara na ọ ka na-edekọ aha ndi mmadu. Ya mere, ọ gaghị ekwunwu mmadu ole ga-alọtakwu.

 N’otu aka ahụ Onyeisi oche Air Peace, Mz. Allen Onyema kwuru na ha dị njikere ịkpọpụta ndi mmadu ndi Naijiria chọrọ ịlọta. O kwuru na ha ga-ebido ọrụ mgbe ọ bụla High Commissioner gwara ha na ha adịla njikere.

Leave a Reply