Igbo News

Xenophobia: Emechiela High Commission nke South Africa

Views

Emechiela ụlọ ọrụ High Commission nke South Africa nke dị na Lagos maka egwu mwakpo ndi ntorobịa na Naijiria.

Onye nnọchianya High Commissioner, Amb. Bobby Moroe, kwuputara nke a n’ụtụtụ a ma kwuo na o nyela ụlọ ọrụ a iwu ka akwụsitụ ọrụ ruo mgbe emeziri okwu.

O kwuru na ihe mere e jiri mee nke a bụ otu ndi mmadu si awakpo ihe enwe enwe nke ndi South Africa nwere.

N’agbanyeghi ihe ndi uwe ojii na-eme ka akwụsị mwakpo a, ụlọ ọrụ a kwuru na ha agaghi anọ n’ọrụ.

Ọzọkwa, Minista Federal Capital Territory, Malam Muhammad Bello, gwara ndi bi n’Abuja, ọ kachasị ụmụakwụkwọ na ndi ntorobia, ka ha ghara mwakpo ihe enwe enwe nke South Africa n’Abuja.

Bello gara n’ihu kwuo na ahia ndi South Africa bụ nke ha na ndi Naijiria na-emekọ ọnụ. ya mere, mwakpo ahịa n’Abuja, ga-emetụta ndi Naijiria.

Dịka ọ na-arịọ ndi bi n’Abuja, o kwuru na ndi nchekwa obodo di njikere ịnwụchi onye ọ bụla mebiri ihe ọ bụla.

Leave a Reply