Igbo News

Xenophobia: Buhari anatala ozi nke Rufai wetara na South Africa ma nye ntuziaka maka ihe a ga-eme

Views

N’ihi mmegbu, ogbugbu na mmebi ihe enwe enwe nke ndi mba ọzọ na South Africa, Onyeisi ala Muhammadu Buhari, dinyere Amb. Rufai Abubakar, onye ntuziaka nke National Intelligence Agency (NIA), dịka onye ozi na South Africa, ebe ọ ga-ezi onyeisi ala South Africa, Cyril Ramaphosa ozi dị mkpa.

Ihe ozi mara ọkwa ya gunyere:

‘Ụdị nchegbu nke mwakpo a na-enye Onyeisi ala Buhari na ndi Naijiria, ihe a ga-eme ka enwe ike kwụsị mwakpo a n’ụdị ọ bụla, otu ndi Gọọmenti Naijiria ga-esi enyere ndi South Africa aka maka ịkwụsị mwakpo a nakwa otu a ga-esi kpuchite ahia ndi Naijiria na South Africa

N’aka nke ọzọ, Onyeisi ala Ramphosa kwuru na ha anabataghị ụdị mwakpo n’ihi na o na-emebi ezi mmekọrịta ha na mba Afika ndi ọzọ nwere. O kwuru na ha ga-agba mbọ hụ na-akwụsịrị ọnọdụ ọjọọ a.

Onyeisi ala Buhari, ka ọ natachara ozi a gwara Minista nke Foreign Affairs, ka ọ ga n’ihu gakwuru ndi ọnụ ruru n’okwu maka ịkwụsị mwakpo a.

Onyeisi ala Buhari nyekwara iwu ka akpọpụta ndi Naijiria niile nọ na South Africa; ndi chọrọ ịlọta Naijiria.

Leave a Reply