FeaturedIgbo News

Xenophobia: Apostle Suleiman agbaara ndị Naịjiria 20 tiketị njem ụla

Views

Ụkọchukwu nke Omega Fire Ministries Worldwide, Apostle Johnson Suleiman, ekwuputala mmasị inyere ndị Naijiria nọ South Africa chọrọ ịlọta aka, site n’ịkwụ ụgwọ njem ha.

O mere ka ndi mmadu mata site n’igwe Twitter ya @ APOSTLESULEMAN.

Onye ozi a kwuru na Tweet; ‘a nụrụ m na ndi Naijiria nari itolu chọrọ ịlọta. M ga-azụ tiketị njem nke mmadu iri abụọ ndi nọ South Africa chọrọ ịlọta. Anyị ga-akpọlatakwa ndi ọzọ site n’amara Chukwu. Chukwu ga-edowe unu niile ndu’.

Apostle Suleiman kwuru na ọ ga-eso Onyeisi oche Air Peace, Allen Onyema, arụ ọrụ oma nke o bidoro.

Leave a Reply