Entertainment

World cup 2019: Akatọọla USA maka mmeri ka meriri ndi Thailand

Views

Nwaada Alex Morgan na ndi otu egwuregwu USA bụ ndi akatọrọ maka mmeri ha nwere na nsompi nke iko mba ụwa megide Thailand n’egwuruegwu bọọlụ nke ụmụnwanyị.

Mba USA bụ ndi ọ dịrị ezigbo mfe imeri Thailand na group F, ebe nwaada Morgan sara ọkpụ goolu ise, Rose Lavelle na Sam Mewis wee saa abụọ abụọ. Lindsep Horan, Megan Rapinoe, Mallory Pugh na Carli Lloryd sara goolu otu otu nke mere ka goolu ha pụta iri na atọ.

Nke a bụ ụdị mmeri a na-ahụbeghị n’asompi iko mba ụwa mana akatọrọ otu USA maka ụdị aṅụrị ha nwere; wee kpọọ ha ndi uko.

Nke a bụ nke mbu mba Thailand na-abia asọmpi iko mba ụwa ụmụnwaanyi mana ụdị mmemme na aṅụrị so mmeri a, napụrụ ndi Thailand obi ọma ha jiri bịa.