FeaturedGossipsIgbo News

Wike atụsiara Onyeisi Mahadum steeti Rivers Ngwongwo

Views

Gọvanọ steeti Rivers ma burukwa onye nlekota nke Mahadum Rivers State, Nyesom Ezenwo Wike, atụpụrụla onye isi ọhụrụ nke Mahadum Rivers State, Ọkz. Blessing Chimezie Didia,ngwo ngwo ya n’ezi.
Onye ọzọ a chụpụkwara n’ọrọ bụ osote onyeisi mahadum (n’ihe banyere nhazi), Ọkz. Magnus Oruwari.

Na nkwuputa ewepụtara na Satọde nke onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ na mgbasa ozi ọgbaraọhụrụ, Simeon Nwakaudu binyere aka, gọvanọ Wike họpụtara Ọkz. Opuenebo B. Owei, bụ osote isi Mahadum (n’ihe banyere agụmakwụkwọ), dị ka onye ha-anọchi anya Onyeisi Mahadum steeti Rivers.

Nkwupụta ahụ gbakwụnyere na Gọvanọ Wike kwụsịrị iwe n’ọrụ na-aga n’ihu na mahadum.
Ọzọkwa, e guzobela kọmitii iji nyochaa usoro ọrụ ma zaghachi Gọvanọ Steeti Rivers n’ izu ụka abụọ.

Leave a Reply