FeaturedIgbo NewsTechnology

UNN emepụta ụgbọala latriki

Views

Mahadum Naijiria, Nsukka emela ihe a na-emebeghi mbu na Naijiria n’imepụta ụgbọala na-ebu mmadụ ise nke latriki.

Mazi Jelani Aliyu bụ onye ntuziaka National Automotive Design and Development Council (NADDCD) kelere ndi Mahadum Naijiria, Nsukka maka ịbụ ndi mbụ imepụta ụgbọala latriki na Naijiria.

Aliyu kwupụtara nke a na Nsukka n’ụbọchị Monde mgbe kpughere ya bụ ụgbọala nke a kpọrọ ‘Lion Ozumba 551’. Ọ bụ ndi Faculty of Engineering kwadoro nrụpụta ọhụrụ a. Ọ gwara mahadum ndi ọzọ ka ha na-eme ụdị nrụpụta nke enwe ike bawanya nka na ụzụ nke obodo a.

Onyeisi Mahadum nke Naijiria, Nsukka bụ Ọkz. Charles Igwe bụ onye gosiri nnukwu obi ụtọ ma kwuo na ọchịchị ya ga-arụpụta ọtụtụ ihe ọhụrụ nke ga-eme ka Mahadum a ganihu. O kelere Onyeisi mahadum a gara aga bụ Benjamin Ozumba maka ihibe ntọala maka nrụpụta ọhụrụ a.

Mazi Ọzọemena Ani bụ onye nhazi UNN Metronic Group kwuru naanị ihe ejiri rụọ ụgbọala a bụ ngwa ọrụ ndi enwetara n’ala anyị. O kwuru na ego ejiri rụọ ya pụtara puku nari naira asatọ (#800,000). O kwukwara na ọ bụrụ na ụgbọala latriki a ju ọfụma, na ọ ga-aga 30 kilometers.

Ndi Vanguard bụ ndi kọwara otu emume a siri gaa ụbọchị ahụ.

Leave a Reply