FeaturedIgbo News

Ụmụokorobia ugbu a na-akpazi mkpa mkpa di egwu

Views

Otu nwokorobia, Nonso Okereke ka akpọpụrụ ụlọ ikpe Igbosere Magistrate na Lagos n’ụbọchị Wenezde maka izuru ego ruru nde naira anọ (4m) n’ụlọ akụ Wema. Nwata jiri igwe Computer ya rụba onwe ya n’ime account ndi ụlọ akụ. O kwuru na Emeka Onumba so yak pa mkpa mkpa.

Ọkaiwu Ingobo Emby gwara ụlọikpe na ụmụokorobia mere nke a na Januari; ebe ha ji computer ha wakpo ụlọ akụ Wema nke dị na 54 Marina St., Lagos Island. O kwuru na ha tinyere ego a na account ọzọ tụpụ ha eke ego ahụ.

Ọkaiwu ji ikpe ha hapụrụ ha ma kwuo na ha ga-akwụ puku nari naira ano iche iche ma kpọta onye ga-ebinye aka n’akwụkwọ maka agwa ha, ruo mgbe a ga-ekpebi ikpe ha n’ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Julai.

Leave a Reply