FeaturedIgbo News

Ụmụnwanyị okpe emela ngaghari iwe maka ụgwọ ụlọọrụ na-emepụta mmanụ ji ha

Views

Ụmụnwanyị nke obodo Sapale Okpe na ndi Sapale Okpe Community Land Trust Association nke Delta Steeti akwụsịla ọrụ na Forte Oil Nigeria Limited maka na ha akwụbeghi ndi Community Land Trust Association ụgwọ ha ji.

Dịka onyeisi ụmụnwanyi ndi a kwuru, edela ọtụtụ leta mana ụlọ ọrụ a azaghachị ha n’ihi ụdị ndi isi ha nwere. Kemgbe Forte Oil nwetachara ụlọ ọrụ African Petroleum, ha ekweghizi ka a na-enwe nzukọ n’etiti ha na ndi obodo ahụ. Ọ kọwara na ha chọrọ ha ụwa mara ihe a na-eme ha nke mere ha jiri bido ngaghari iwe a.

Onye nkwuchite ọnụ nke ụlọ ọrụ a bụ Mz. Boyode Haruna kwuru na ezigala ozi n’isi ụlọ ọrụ dị na Lagos. Ọ gwara ndi na-eme ngaghari iwe a ka ha wetuo obi n’ihi na ihe dị ọkụ ga-emecha juo oyi.

Leave a Reply