FeaturedGossips

Ụmụnwanyị Naijiria ebugala okwu Omeiwu Abbo UN

Views

Otu National Council for Women’s Society (NCWS), n’ụbọchị Sọnde ekwuola na ha agaghị anabata arịọrịọ nke onye omeiwu Elisha Abbo rịọrọ maka ịkụ nne nwanyi ihe n’Abuja.

Onyeisi oche NCWS bụ Odoziakụ Hadiza Umar gwara ndi nta akụkọ n’Abuja na ha chọrọ ka enye Abbo ntaramahụhụ siri ike nke ga-eme ka ndi ọzọ ghara iweli aka ha tie nwanyi ihe. Ha chọrọ isi n’ụzọ di otu a kwụsị agwa iti nwanyi ihe n’ụlọ ahia, n’ụlọ ọrụ ma n’ebe ọ bụla. Umar kwuru na ụmụnwanyi abụghị anụmanụ, ya mere ihe ọ bụ ga-ebute otiti ihe n’ụzọ ọ bụla, na-egbughi oge ọ bụla.

Hadiza Umar kpọkuru ndi United Nations na otu mba ụwa ndi ọzọ ka ha nye aka hụ na e nyere Elisha Abbo ọpịpịa kwesiri omume ya ka eme ka ụdị ihe a hara ime n’ọdịnihu.

Onye ntụziaka Gender Development Department bụ Mrs Hart Agnes ekwuola na ngalaba ya aghaghi ime ihe ha kwesiri ime ka enwe ike kwụsị mmegide ụmụnwanyi, ụmụaka na ndi ụwa na-atụ n’ọnụ.

Leave a Reply