FeaturedIgbo Culture

Ụmụnwanyị Aba enyela Ikpeazụ abalị otu nari imezi ụzọ Aba

Views

Ụfọdụ ụmụnwanyị, ndi pụtara dịka Women for Change Initiative and Equity Organisation na Tuzde, mere ngagharị iwe maka ọnọdụ ọjọọ nke ụzọ Aba.

Ụmụnwanyị ndi a nyere Gọvanọ Okezie Ikpeazu abalị otu nari iji mezie ụzọ ma ọ bụghị ya, ha ga-eme ngagharị iwe ọzọ, nke ụmụnwanyị puku iri ga-aga ikwuchi n’ihu Abia State Government House.

Onyeisi otu a bụ Odz. Jane Ogbonna kwuru na oge ịgba nkịtị agafeela. O kwuru na obi adịghị ụmụnwanyị Aba mma. O kwukwara na e kwesiri imetara onye ọ bụla bi n’Aba obi dị mma ebere.

Onye Odee akwụkwọ Gọvanọ, Mz. Onyebuchi Ememanka kwuru na Gọvanọ na-eleba anya n’ụzọ ndi a.

Leave a Reply