FeaturedIgbo News

Ụmụakwụkwọ agbagbuo otu onye Uwe Ojii na Cross River

Views

A gbagbuola otu onye uweojii aha ya bụ Gabriel Amawu na Cross River steeti. Gabriel Amawu bụ onyeisi ndị uweojii n’Obudu nke dị na mgbago ugwu nke Cross River.

Ndị uweojii mere ka amata na a gbagburu Amawu n’abalị Tuzde ka ndị uweojii na ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-enwe nghọtahie n’Obudu.

Dịka ndị Premium Times siri kọwaa, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Obudu bụ Irene Ugbo sịrị; ” Ihe a mere n’abalị ụnyaahụ n’agbata elekere 10 na elekere 11 nke ime abalị. Ha na ụmụakwụkwọ nọ ebe a na-enwe ọgbaghara n’ihi otu nwata akwụkwọ ha kpọchiri.”

3 Comments

Leave a Reply