FeaturedIgbo News

Ụmụakwụkwọ AAU awakpo ndị nkuzi ha maka abụbụ ọrụ

Views

Ụmụakwụkwọ Mahadum Ambrose Ali n’ ụbọchị Tuzde, wakporo ndị otu Academic Staff Union of Universities; ndị nọ na-enwe nzukọ n’ime ụlọakwụkwọ.

Ụmụakwụkwọ ndị a, ndị na-eme ngagharị iwe maka abụbụ ọrụ na Mahadum a, bucha akwụkwọ nke e dere, ‘No more Strike’, ‘We are tired of staying at home’ na ihe ndi ọzọ na bekee.

Ha tisara nzukọ nke ndị nkuzi na-enwe ka enwe ike gbochie ha inwe mkpebi maka abụbụ ọrụ.

Onye nọ mgbe nke a mere kwuru na ụmụakwụkwọ ndị a wakporo ha ebe ha na-eme nzukọ, were na-ama okwute, mkpirisi kalama na ihe ndị ọzọ.

Ụfọdụ ndị nkuzi emerụrụ ahụ ka ebugara ụlọ ọgwụ nke dị n’Ekpoma ozigbo.

Ụmụakwụkwọ ndị a mere ihe a kwuru na ebumnobi ha bụ ka ha kwasasịa nzukọ a, ka ha ghara ịga abụbụ ọrụ nke ga-eme ka ha nọrọ n’ụlọ.

N’ikwu maka ihe a mere, Onyeisi oche ASUU nke AAU, Ọkz. Monday Igbafen, kwuru na ụmụakwụkwọ ndị a  egbuchaala ha na ọ bụ amara Chukwu zọpụtara ha. O kwuru na nchekwa adịghịzi na ya bụ Mahadum.

Onye nkwuchiteọnụ nke Mahadum AAU katọrọ omume ụmụakwụkwọ ndị a ma kwuo na Mahadum a ebidola inyocha omume a. Ọ rịọrọ ndị nkuzi ka ha gaghachi azụ mewe ihe ha kwesịrị ime n’ihi na ha ga-agba mbọ hụ na e nwere udo na Mahadum.

Leave a Reply