Igbo News

Ụmụaka ruru nde asatọ anaghị aga akwụkwọ na Naijiria: UNICEF

Views

Ụlọ ọrụ United Nations Children’s Fund ekwuola na ụmụaka nde asatọ anaghị aga akwụkwọ na steeti iri nakwa steeti isi ụlọ ọrụ Naijiria bụ Abuja.

Steeti nke okwu a metụtara bụ Bauchi, Niger, Katsina, Kano, Sokoto, Zamfara, Kebbi, Adamawa, Gombe na Taraba.

N’okwu ha nyere n’ụbọchị emume ụmụaka Afrika, onye nnọchi anya UNICEF na Naijiria bụ Peter Hawkins kwuru na ndi ntorobia puku abụọ agbaala akwụkwọ megide ndi ọrụ gọọmenti ndi nọ na steeti ndi a akpọrọ maka ha anaghị akwado agụmakwụkwọ ụmụaka, ọkachasi ndi nke nwaanyị.

Hawkins kwuru na ụmụaka nọ na mpaghara ugwu nke Naijiria enweghi ike ịgụ akwụkwọ n’ebe dị mma. O kwukwara na nsogbu ndi a na-enwegasi na mpaghara ugwu emebiela ọtụtụ ụlọakwụkwọ ma gbukwa ọtụtụ ndi nkuzi, nke mere na ụmụaka enweghizi ike ịga ụlọakwụkwo ebe ụmụaka ndi nwaanyị bụ ndi a na-atọrọ mgbe ọ bụla n’obodo ndi a ma ha gaa ụlọakwụkwọ.

Leave a Reply