FeaturedIgbo News

Ụlọọrụ Onyeisi ala Naijiria ekwu okwu maka ọlụlụ Sadiya Umar Farouq

Views

Ụlọọrụ Onyeisi ala emechiela okwu maka mkpesa ha nwetara gbasara ọlụlụ Onyeisi ala Mohammadu Buhari na Sadiya Umar Farouq.

Mkpesa a kwuru na Buhari ga-alụ Minista nke Humanitarian Affairs, Disaster na management, Sadiya Umar Farouq taata.

Ozi a pụtara ihe maka na nwunye onyeisi ala, Aisha Buhari anọghị na Presidential Villa ọtụtụ oge.

E kwuru na Nwada Farouk na Onyeisi ala Muhammadu Buhari bụ ezigbo ọyị na Presidential Villa.

N’agbanyeghi nke a, onye ndụmọdụ onyeisi ala na ihe gbasara ozi na ọha, Femi Adesina, kwuru na nke a abụghị eziokwu kama na ọ bụ nkata akpara akpa.

Sadiya Farouq n’aka nke ọzọ kwuru na o nweghi mgbe ya na Buhari kpara ịlụ.

O kwuru nke a site n’igwe Twitter ya. O kwuru ya na Buhari bụ naani ezigbo enyi.

Ọ rịọrọ ndị Naijiria ka ha gbahapụ ihe asịrị ahụ n’ihi na ọ bụghị eziokwu.

 

Leave a Reply