FeaturedIgbo News

Ụlọikpe enyela EFCC iwu ka ha wepụta igbe ego ezuru ezu dị

Views

Ụlọikpe nke gọọmenti etiti na Ibadan, na Fraide, nyere ndị Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) iwu ka ha wepụta igbe dị otu narị na isii (106), nke etinyere ego ruru nde puku naira itolu (#900m), nke bụ ego ndị ọrụ ụlọakụ Zenith zuru n’ohi.

NAN kwuru na ndi EFCC boro Bolade Ajuwan na Samuel Ogbiede, ha na mmadu isii ndị ọzọ; ndị ọrụ Central Bank nke Naijiria, ebubo ohi.

Mmadu isii ndị a bụ ndị e kwuru na buuru ego na CBN. Ndị ọrụ ụlọakụ Zenith bụ ndị nyere ha aka imezu omume ọjọọ ma werekwa ego ụfọdụ nke ha ketara.

Ndi EFCC, mgbe akpọpụtara ha n’ụlọikpe, kwuru na ezigbo ego adịghị n’igbe ndị a ha bukọtara. Ha kwuru na ihe juru ebe ahụ bụ naanị #100, #50 nakwa akwụkwọ efu.

Onye ọkaikpe na-ahụ maka okwu, P. I. Ajoku, yigharịrị ya bụ okwu ruo ụbọchị abụọ na atọ nke ọnwa Decemba.

 

Leave a Reply