FeaturedIgbo News

Ụlọikpe emechiela ụlọ ụka dị n’Anambra maka mkpọtụ

Views

Ụlọikpe nke dị na Nnewi, Anambra steeti emechiela otu ụlọ ụka ọgbara ọhụrụ maka mkpọtụ.

Ndị Environmental Health Services na Nnewi North Local Government kpọpụrụ ụlọ ụka a ụlọikpe. Ha boro ụlọ ụka ebubo ịdọwa igwe eji ekwu okwu ise na ihu ụlọ ụka ma na-emechi ndị mmadu ntị ọkachasị n’abali. Ha kwuru na nkea adịghị mma n’ahụ mmadu.

Ya mere, enyere onyeisi ụlọ ụka a abalị iri isi n’ebe ha nọ kwapụ ma ọ bụ ga nga otu afọ.

Otu onye bi n’akụkụ ụlọ ụka kwuru ọ bụ ihe ọṅụ na emechiri ụlọ ụka n’ihi na kemgbe emepere ya bụ ụlọ ụka, ndị mmadu enweghi udo ma ọlị.

O kwuru: ‘ anyị niile bụ ndị otu Kristi mana ihe anyị na-achọ ka ụkọchukwu a mara bụ ihe egwu dị n’omume ya; mmegide ọ na-emegide ndu na ahụike ndị mmadu.

Leave a Reply