Igbo News

Ụlọikpe atụọla nwa akwụkwo OOU nga

Views

Ọkaiwu Ibrahim Watilat nke federal court 2, nke di na Abeokuta, Ogun Steeti, n’ụbọchi Wenesde bụ ụbọchị atọ nke ọnwa Julai atụọla Junaid Oladipupo Moses nga ọnwa anọ.

Junaid, nwokorobia dị afọ iri abụọ na ise bụ nwata akwụkwọ na-agụ Microbiology na Olabisi Onabanjo University nke na-enweghi ike izata ọnụ ya n’ikpe ya.

Junaid bụ onye ndi Economic and Financial Crimes Commision (EFCC) kpọpụrụ ụlọikpe maka ịnapụ ndi mmadu ego nke a na-akpọ Yahoo.

Ọkaiwu Ibrahim enyela iwu ka atụọ ya nga ọnwa anọ nke bidoro ụbọchị ahụ anwụchiri ya ma nyekwa iwu ka anapụ ya ụgbọala Lexus ES 330, nke o nwetara na wayo ọ na-egwu ndi mmadu.

Leave a Reply