FeaturedIgbo News

Ụlọ ọrụ NNPC enweela onye isi ọhụrụ

Views

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ahọrọla Mele Kyari dịka onye isi ndi na-elekọta NNPC. N’okwu nke onye na-ekwuchite ọnụ ndi NNPC kwuru, onyeisiala Naijiria họrọkwara mmadu iri ọzọ nke o tinyere n’ọkwa dị iche iche n’ụlọ ọrụ NNPC.

Tụpụ e mee ya onye isi ndi nhazi a, Mele Kyari bụ onye na-elekọta ‘Crude Oil Marketing’ nke NNPC nakwa onye nnọchite anya Naijiria na ‘Organisation of Petroleum Exporting Countries (OPEC)’.

Buhari gwara ndi dairektọ ọhụrụ ka ha ga n’ihu rụwa ọrụ rue ụbọchị asatọ nke ọnwa Julai mgbe a ga-ehibe ha dịka o kwesịrị.

Onye isi NNPC nke na-apụ apụ bụ Maikanti Buru ekwela ndi ahọpụtara n’aka ma gwa ha ka jisie ike n’ọrụ. Maikanti bụ onye na-ala ezumike nka n’ọnwa na-abịa abịa.

Leave a Reply