FeaturedIgbo News

Ụlọ omeiwu enyela iwu ka amachie ọgwụ a na-akpọ Avastin

Views

Ụlọ omeiwu nke Naijiria enyela ụlọọrụ National Agency for Food and Drugs Administration and Control (NAFDAC) iwu ka ha gbochie mmepụta ọgwụ a na-akpọ Avastin n’obodo Naijiria. Ha nyere iwu a maka mkpesa ha nwetara na ya bụ ọgwụ ekpuola mmadu iri agbara ya isi.

Onye nyere mkpesa maka nke a bụ Omeiwu Aishutu Dahiru. Avastin bụ ọgwụ eji agwọ ọrịa anya nke diabetis na-ebute: a na-agbanye ya n’anya onye na-arị ọrịa.

Ndi National Eye Center dị na Kaduna tụrụ ndi ọrịa iri biara n’ụlọọgwụ ha ọgwụ a na ụbọchị iri abuọ na asatọ nke ọnwa May, ma ndi a bụ ndi kpuru isi ozugbo a gbachara ha ọgwụ a.

Dahiru kwuru na ndi nta akụkọ New York Times ekwuola na n’afọ 2011, na ọgwụ a kpuru ndi mmadu isi ebe ndi ọzọ bụ ndi ji otu anya ahụ ụzọ.

Ndi kpuru isi nọ n’ụlọ ọgwụ ebe a na-elekọta ha ka amara ma o nwere ihe a ga-emetanwu gbasara anya ha. Ụbọchị ise nke ọnwa Julai ga-eme ya ụbọchị iri atọ na isii ndi a kpuru isi.

Onyeisi ndi omeiwu Naijiria bụ Ahmed Lawan ehibela kọmitii mmadu asaa ndi ga-eleba anya n’ọgwụ a ma gwakwa ụlọ ọrụ Federal Ministry of Health ka ha kpachara anya ha maka ọgwụ ndi a na-emepụta tụpụ erewe ha. Ọ gwakwara ndi NAFDAC ka leba anya n’ọgwụ a ma gwa ọhanaeze ihe ha hụtara.

Leave a Reply