FeaturedIgbo News

Ụlọ Nnọchianya Naịjiria dị na Canada Emechie

Views

Ụlọ nnọchianya Naịjiria (Nigerian High Commission), nke dị n’Ottawa, Canada emeela ka ọhanaeze mara na ha akwụsịla ịrụ ọrụ.

Ha mere ka a mara nke a n’ozi ha tinyere na websaịt ha. N’ozi ha dịka Leadership siri kọwa, ha kwuru:

‘ the special intervention arrangement for emergency cases “on discretionary basis” had been suspended’

Gụọ: Gọọmentị Sierra Leone azụọ Innoson Ụgbọala $4.7m ka Gọọmentị Naịjiria jụchara ịzụ ụlọọrụ Innoson Ụgbọala

Ha mere ka a mara na ha wepụtara usoro ndị Naịjiria nwere ihe mberede ga-eji anata enyemaka site n’ozi akpọmoku nke ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka e nwere ike ịnabata n’otu oge, mana ọtụtụ ndị Naịjiria bi Canada ekweghi agbaso ya bụ usoro. Ha na-eme ka o siri masị ha mana ebute ọgbaghara na ya bụ ụlọ nnọchianya Naịjiria.

Leave a Reply