FeaturedIgbo News

Ụlọ ikpe atụọla mmadu atọ nga maka ire ụmụaka

Views

Ụlọ ikpe etiti nke ndi Port Harcourt atụọla mmadu atọ nga afọ asaa maka ire mmadu. Aha ndi a atụrụ nga bụ: Olujimi Mayokun, Peace Eze na Adaugo Okafor.

Ndi kwuputara nke a bụ ụlọ ọrụ National Agency for Prohibition of Trafficking in Persons (NAPTIP) n’ụbọchị Wenesde.

Dika ha kwuru, otu nwoke a na ụmụnwanyi abụọ ndi a bụ ndi akpọpụrụ ụlọ ikpe n’ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Novemba. 2018 maka izu nwata na ire mmadu. Ha kwuru na ndi ụlọ ọrụ NAPTIP na ndi uwe ojii nwụchiri ha mgbe ha na-eme ya bụ omume ọjọọ.

Mgbe elebara anya n’okwu a, aghọtara na ha zuru nwata nwoke dị afọ abụọ n’Awka, Anambra Steeti, wee kpọga Port Harcourt, Rivers Steeti. Ndi nke nwanyi tọrọ nwa nwoke onye agbatobi ha ma kpọrọ nwa ahụ gawa Port Harcourt ebe ha nyere ya Mayokun ka ọ re ya.

Ha kpọrọ nwa ahụ gaa Omega Power Ministry, ebe eresiri ya onye a na-amaghị aha ya. Mgbali niile a na-eme ka amara ma a ga-ahụ nwata a ma ọ bụ onye eresiri ya bụ ihe lara n’iyi.

Onyeisi NAPTIP kwere nne na nna nwata ahụ nkwa na ha ga-anwa ike ha ihụ na-achọtara nwa ha. O nyekwara ndi nne na nna ndumọdụ ka ha kpachara anya maka onye ha na-ahapụrụ ụmụ ha.

Leave a Reply