FeaturedIgbo News

Ụlọ akwụkwọ dị na Nsukka enwetala nturu ugo n’aka gọọmenti etiti

Views

Gọọmentị etiti ekwuputala na Model Secondary School, Nsukka, emeriela na ‘President’s Teachers and School Excellence Award’ nke afọ 2019.

A ga-enye ụlọ akwụkwọ a nturu ugo ha na Satọde, ụbọchị ise nke ọnwa Ọktoba, n’Eagle’s Square, Abuja, n’elekere iri nke ụtụtụ.

Nturu ugo nke ha nwetara bụ nke so nyocha e mere n’ụlọ akwụkwọ sekọndiri niile dị na Naijiria nke gọọmenti nwe. Nyocha a gbadoro ụkwụ na ụdị akụrụngwa ha nwere, ọba akwụkwọ nke ịntanetị, ụdị nkuzi na ọmụmụ ihe a na-enye ụmụ akwụkwọ.

Model Secondary School nwetara nturu ugo n’ihi ezi ọrụ nke Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi na-arụ maka agụmakwụkwọ n’Enugu steeti.

Ọrụ Ugwuanyi rụgasiri gunyere: idozi ahụ ụlọ akwụkwọ a, ịrụ ebe obibi na ebe a na-eri nri n’ụlọ akwụkwọ a, ịrụ ọba akwụkwọ nke ịntanetị nakwa itinye ndi nkuzi ma ihe ekwe na-akụ n’agụmakwụkwọ.

Ihe ndi a na ihe ndi ọzọ ọ na-eme mere ndi mmadu ji ekwu na n’ezie, Enugu nọ n’aka Chukwu.

Leave a Reply