Igbo News

Ụlọ adaala n’Ọnitsha n’ihi mmiri ozizo

Views

Ụlọ elu atọ adaala n’Ọnitsha, Anambra Steeti, na Wenesde n’ihi nnukwu mmiri ozizo zoro ebe ahụ.

Ọzọkwa, mgbidi Ọnitsha Correctional Centre nke a na-akpọbu Onitsha Prison, dakwara.

Onye akaebe gwara ndi Punch na o nweghi onye nwụrụ n’ihe a merenụ. Onye uwe ojii na-ahụ maka ọha, Haruna Mohammed, gara ebe ihe a mere, ma kwuputa na o nweghi ndi nwụrụnụ.

O kwuru na ụlọ ahụ nke dị na 22 Nkisi Aroli, Onitsha, bụ nke Chukwuma Njeka. O kwuru na amatabeghi ihe egole mebiri na ya bụ ụlọ.

Ndi uwe ojii chekwara ebe ihe a mere ka ndi ohi ghara izuru ihe di n’ụlọ ahụ.

N’aka nke ọzọ, ndi uwe ojii chekwara Onitsha Correctional Centre, ebe mgbidi dara. Ha kwukwara na o nweghi ndi nwụrụnụ nakwa na o nweghi ndi si n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ gbafuo.

Leave a Reply