FeaturedIgbo News

Ụgwọ ọnwa ndị Kọpa ga-arị mgbe na-adịghị anya – DG

Views

Onyeisi ochichi (DG) nke National Youth Service Corp (NYSC) Brig. Jeneraị Shuaibu Ibrahim emeela ka ndị Kọpa mara na ha ga-enyocha ụgwọ ọnwa ha bụ N19,800 ka ọ gbago karịa.

Oriakụ Adenike Adeyemi, onye na-ahụ maka mgbasaozi ndị NYSC  na nkwupụta o mere ụbọchị  Mọnde kwuru, Ibrahim, onye kwuru nke a mgbe ya na ndị otu ya nọ na-akparịta ụka mgbe ha na-arụ ọrụ nleta na Lagos, kwere nkwa na a ga-abawanye ụgwọ ha ozugbo gọọmentị Federal bidoro ịkwụ ụgwọ nke ụgwọ ọnwa ‘minimum wage’ ha kpebiri.

Adeyemi kwuru na onye isi NYSC ahụ kwekwara ndị Kọpa nọ na mba ahụ nkwa ọdịmma.

O mere ka ha mara na a na-agba mbọ ihụ na akwalitere ọdịmma ndị Kọpa na Naịjiria.

“Ma, ọ dụrụ ha ọdụ ka ha ghara ịbanye njem enyeghị ha  ikike nke nwere ike itinye ndụ ha na nsogbu.

“Ọ dọrọ aka na ntị na a ga-agbaso iwu NYSC were taa onye ọbụla dara iwu ahụhụ,”

Leave a Reply