FeaturedIgbo News

Tanker fuel egbuola ọtụtụ mmadu na Benue

Views

Ọtụtụ mmadu na ụgbọala bụ ihe alara n’iyi ụnyahụ na Benue Steeti n’ihi tanker bu mmanụ ọkụ dara ma nwurukwa ọkụ. Ihe mberede a mere n’ụzọ Ahumbe – Makurdi.

Onye hụrụ mgbe ihe a mere gwara ndi Daily Post na mgbe tanker dara, na mmanụ ọkụ wụpụtara n’ala. Mgbe nke a mere, ndi bi n’obodo ahụ pụtara na-eku mmanụ ọkụ tupu o nwuru ọkụ.

Na nchọcha e mere, e kwuru na mmadu iri abụọ na isii nwụrụ ebe ọtụtụ mmadu merụrụ ahụ n’ihe mberede a.

Leave a Reply