FeaturedIgbo News

Tafawa Balewa ma na mmanụ dị n’ugwu mana ọ metụghi ya aka – Abdullahi

Views

Amb. Yerima Abdullahi, onye bụbu Minista nke agụmakwụkwọ na nka na ụzụ, kwuru na Tafawa Balewa, onyeisi ala mbụ na Naijira, ma na mmanụ dị n’Ugwu mana ọ metụghị ya aka.

Abdullahi kwuru na ebumnuche Tafawa Balewa bụ ka ọgbọ ọhụrụ a nwere ya bara onwe ha uru.

O kwukwara na nchọpụta mmanụ n’Ugwu, ọkachasị na Gondola Basin emenyela ndị mmadu ihere; ndị kwuru na ha bụ parasaiti nyere Naijiria.

Abdullahi kwuru na chi ọma ha efola. O kwukwara na ha na-atụ anya ihe nweta ndị ọzọ dịka ọla edo na kọpa n’Ugwu.

O kwuru na obi dị ha ụtọ maka nchọpụta a n’ihi na ọ ga-abanwanye akụ obodo a. O kwukwara na ha ga-anabata ndị Naijiria ọ bụla chọrọ iketa oke na onyinye Chukwu nyere ha.

 

Leave a Reply