EntertainmentIgbo News

Super Eagles alaala azụ n’ogo ndi kacha agba bọọlụ – FIFA

Views

Dika ndi nlekọta egwuregwu bọọlụ bụ FIFA siri kwuo, otu Super Eagle alaala azụ n’ogo ndi kacha agba bọọlụ. Ụlọ ọrụ FIFA kpọrọ ogo ndi a n’ụbọchị Tọọzdee iri na atọ nke ọnwa Juun. Ha kwuru na Super Eagles bụ ndi nọ n’ogo iri anọ na abụọ bụzi ndi nọ n’ogo iri anọ na ise.

N’agbanyeghị nke a, Super Eagles ka bụ ndi nọ n’ogo nke atọ ma abịa na ndi ọkacha agba n’Afrika. Ebe otu mba Senegal bụ ndi mbu ma otu mba Tunisia abụrụ ndi nke abụọ.

N’ogo ụwa niile, mba Belgium bụ ndi mbu, otu France a na-esote ha, ebe otu mba Brazil na England na-abịa dika ndi nke atọ na anọ.

Leave a Reply