FeaturedSports

Super Eagles abụrụ ndi nke atọ kacha agba bọọlụ n’ Afrika: FIFA

Views

Otu egwuregwu mba Naijiria, Super Eagles, agbagoola n’ọkwa nke otu Federation of International Football Association na-enye. Otu Super Eagles nọzi n’ọkwa iri atọ na atọ ugbu a kemgbe ha pụtara dịka ndi nke atọ na asọmpi African Cup of Nations (AFCON) n’Egypt.

N’ọkwa a nke FIFA wepụtara n’ụbọchị Tọzde, otu Super Eagles enwetala akara otu puku, nari anọ na iri asatọ na otu (1,481): n’ọnwa Juun, ha nọ akara otu puku, nari anọ, na iri atọ na atọ (1,433).

Ugbu a, otu Naijiria nọzi dịka otu egwuregwu nke atọ kachaa agba bọọlụ n’Afrika, ebe otu Senegal na Tunisia ka bụ ndi mbu na ndi abụọ n’otu n’otu.

Leave a Reply