FeaturedIgbo News

South Africa ekwela inye ndị Naịjiria akwụkwọ njem afọ iri

Views

Ndị South Africa na Naịjiria enwela nkwekọrịta maka inye ndị Naịjiria akwụkwọ njem afọ iri.

Nke a bụ ihe so mmechi nzukọ Bi-National Commission nke South Africa na Naijiria, nke e mere na Pretoria, South Africa, n’izu a.

Ha kwuru na ndị a ga-enye akwụkwọ njem a bụ ndị na-azụ ahịa, ndị na-agụ akwụkwọ nakwa ndị na-eme njem kwa mgbe kwa mgbe.

Onye wetara ozi a bụ onye enyemaka Onyeisi ala Muhammadu Buhari n’ihe gbasara mgbasaozi, Bashir Ahmed, site n’igwe ‘Twitter’ ya.

 

Leave a Reply