FeaturedIgbo News

Sị jide ndị ọchị ehi maka Ụkọchukwu e gburu n’ Enugwu- Ọhanaeze

Views

Ndi ntorobia ọhanaeze ndi Igbo n’ụbọchị Satọde ekwuola na ha ga-etinye uchu n’ịchụpụ ndi ọchị ehi na-egbu ndi mmadu n’ubi niile dị na local gọọmenti iri itoolu na ise, nke di na ala Igbo.

Dịka Onyeisi ndi ntorobia Ọhanaeze ndi Igbo, Okechukwu Isiguzoro siri kwuo, ihe kpatara ha jiri nwee ụdị atụmatụ bụ otu ndi ọchị ehi siri gbuo ụkọchukwu ụka katọlik, Rev. Fr. Paul Offu n’ụzọ Ihe-Agbudu, Agwu LGA, Enugu Steeti.

O kwuru na ndi a ka nwere atụmatụ igbu ọtụtụ ụkọchukwu nke mpaghara ndida ugwu. Ya mere, a ga-agba mbo hụ akwụsiri ụdị ihe ọjọọ a. N’idozi okwu a, Isiguzoro gwara ndi ntorobia ndi Igbo, ndi na-achọ Biafra na ndi ike kwere, ka ha tinye isi n’ọhịa, ka enwee ike ịchụpụ ndi ọchị ehi.

Ndi ntorobia ọhanaeze rịọrọ gọọmenti etiti ọ kachasi osote onyeisiala, ka ha nye aka kpuchite ụmụ Chineke nọ n’obodo a. O kwukwara na ndi a nwere ike igbu ọtụtụ ndiisi ụka na ọwụwa anyanwụ Naijiria.

O kwukwara ka akpọpụta ndi ụkọchukwu Redeemed Christian Church of God, ndi atọọrọ n’ụzọ Ijebo-Ode, mgbe ha na-aga nzukọ na RCCG camp.

Leave a Reply