FeaturedIgbo News

SexForGrade: Ikuku BBC ekuola, ahụla ike ọtụtụ ndị nkuzi mahadum Naijiria

Views

Ihe nkiri BBC, nke BBC Africa Eye wepụtara ekpughela otu onye nkuzi, Dkt. Boniface Igbeneghu, onye bụbu Sub-Dean Faculty of Arts na Mahadum Lagos, Akoka, ebe ọ na-ebikasị nwata akwụkwọ e chere na ọ dị afọ iri na asaa aka.

Site n’ihe nkiri a, e kwuru na Dkt. Boniface Igbebeghu bụ onye ụkọchukwu ụka Foursquare.

Ndị nta akụkọ BBC gbara ụmụakwụkwọ Mahadum nke Lagos ajụjụọnụ ihe ruru ọnwa itolu maka nsogbu mmekọahụ nke ndị nkuzi na-enye ụmụakwụkwọ ndị nwanyị.

Site n’ajụjụọnụ a, ụmụakwụkwọ tụrụ Dkt. Boniface aka ọjọọ nke mere ndi BBC jiri họrọ ya maka nyocha.

Ndị BBC dunyere onye nta akụkọ, onye zoro onwe dịka nwata akwụkwọ na-achọ nnabata na mahadum a, ka o jekwuru Dkt. Boniface Igbeneghu.

Igbeneghu kpọrọ nwata a oku n’ọfisi ya ugboro ole na ole, ebe ọ nọ na-ajụgasị ajụjụ nke ụfọdụ n’ime ya bụ nke gbasara mmekọahụ.

N’otu nzukọ ha nwere, ọ kpọketara nwata a nso ma makuo ya, ma na-ekwe ya nkwa na ọ gaghị emerụ ya ahụ.

Ndi BBC gakwuru nwoke maka omume ọjọọ mana nwoke a ekwughi okwu ọ bụla iji gbara isi onwe ya.

E kwukwara na inwe mmekọahụ maka nnabata na inweta maakị n’ule bụ ihe na-ewu ewu na mahadum Naijiria niile.

Lee ihe nkiri ebe:

https://www.youtube.com/watch?v=we-F0Gi0Lqs

Leave a Reply