FeaturedIgbo News

(Video)Sen. Ifeanyi Ubah nyere m Ego M jiri gba WAEC na JAMB  – Akunne Francis (Igwe Credo)

Views

Ozi ruru Odumblog ntị na Fraịde mere ka a mara na Sen. Dr. Patrick Ifeanyi Ubah onye nke na-anọchite anya Anambra South n’ụlọ omeiwu dị n’Abuja azụnyela Maazị Francis Akunne ụgbọala ma mee ya otu n’ime ndị nnọchiteanya AFA IGBO EFUNA .

Francis Akunne onye e ji ịma mbem na ime ihe mkpaọchị nakwazi ejije Nollywood were mara gara n’ihu kelee Sen. Dr. Patrick Ubah.

Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ bụ ego Sen. Dr. Patrick Ubah(Ebubechukwuzo) fere ya ebe ọ gara ịma mbem ka o jiri gbaa WAEC, na JAMB nke o jiri nweta nzere B.A na mahadum Nnamdị Azikwe na 2013.

 

5 Comments

Leave a Reply