Igbo News

Rwanda, DRC na Malawi ewerela isi ha n’emume a ga-eme na South Africa: Xenophobia

Views

N’ihi mwakpo nke na-aga n’ihu na South Africa, obodo atọ apụọla n’emume World Economic Forum (WEF) nke afọ a.

Obodo ndi a; Democratic Republic of Congo, Rwanda na Malawi ewepụla onwe ha na nzukọ a, nke e kwuru na-aga enwe na Capetown, South Africa, na Wenesde, ụbọchị anọ nke ọnwa Septemba.

World Economic Forum bụ otu mba ụwa nke gbadoro ụkwụ na mmekọrịta mba ụwa na ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, azụmahia na mkpa ndi ọzọ.

N’ihi mwakpo a nke bidoro n’izu gara aga, obodo ndi a ewerela isi ha.

Leave a Reply