FeaturedIgbo News

Ruga: Anyị ga-enye ndi Fulani ọchị ehi ala: Gov. Sule

Views

Gov. Abdullahi Sule nke Nasarawa Steeti kwuru na steeti ya ga-emezu atụmatụ gọọmentị nke etiti nke bụ maka inye ndi ọchị ehi ala nke a na-akpọ Ruga settlement n’agbanyeghi na gọọmenti ka mechiri okwu gbasara ruga n’ihi agbamụkwụ ndi mpaghara obodo Naijiria dị iche iche gbara ya bụ atụmatụ.

Gọvanọ Sule kwuru nke a na Lafia mgbe otu ndi isi Fulani bịara ileta ya n’ụbọchị Sọnde. O kwuru na ọ bụ ezie na gọọmenti etiti emechiela ya bụ okwu kama na obodo ndi chọrọ ịga n’ihu maka atụmatụ a nwere ike imezu ya. O kelere ndi Fulani ndi a bịaranụ ma rịọ ha ka mee udo n’etiti ha na ndi obodo ndi ọzọ.

O jikwa ohere ahụ na-arịọ ndi ntorobia ka ha hapụ ịkpọghara ndi mmadu na izu ohi ma bidoịgụ akwụkwọ ka ha nwee ike inye aka kwalite obodo a.

Leave a Reply