Igbo News

RevolutionNow: Egwu ejidela ndi uwe ojii

Views

Onyeisi ndi uwe ojii, Mohammed Adamu enyela ndi uwe ojii niile nọ na gburugburu steeti iri atọ na isii nọ n’obodo iwu ka ha hụ na-enwere udo n’ebe ha nọ

Adamu, na Sọnde nyere the kọmishọna ndi uwe ojii iwu ka ha jisie ike mee ka ngaghari iwe ndi ‘RevolutionNow’ ghara ibute ọgbaahara n’obodo a.

Ndi Punch mere nyocha were chọpụta na ahụ na-ama ndi uwe ojii jijiji maka ndi ngaghari iwe a. ihe kpatara nke a bụ ndi Islamic Movement in Nigeria kwuru na ha ga na-eme ngaghari iwe ruo mgbe akpọpụtara onyeisi ha, Ibrahim El-zakzaky.

Egwu ndi uwe ojii bụ na ndi Shiites nwere ike iso ndi ‘RevolutionNow’ were mee ka enwe ọgbaaghara nke ndi uwe ojii na-amaghi ka a ga-esi eme ya.

Leave a Reply