Igbo News

RevolutionNow: ebidola ngaghari iwe; dịka ndi nchekwa obodo ji ‘teargas’ emerụ ndi mmadu ahụ

Views

Tụmadị iwu niile na mkpu nke gọọmenti etiti, ndi mmadu gara n’ihu ime ngaghari iwe nke ndi ‘RevolutionNow’, nke onye odee akwụkwọ sahara reporter, Mz. Omoyele Sowore kpokuru.

Ndi nchekwa obodo n’okpuru ‘Joint Internal Security Operational Platform’, nke ndi army, navy na air force mejupụtara, agbaala ebe egwuregwu nke obodo, nke di na Surulere gburugburu n’isi ụtụtụ Mọnde, wee gbochie ndi mmadu ibanye n’ebe ahụ.

Mana otu ọ dị ugbu a, ndi mmadu na-ejighi ngwa agha ọ bụla ebidola ngaghari iwe maka mgbanwe; ha na-agụkwa egwu dị iche iche nke na-egosi na ebumnuche ha bụ maka mgbanwe.

N’otu aka ahụ, ndi nchekwa ji ‘teargas’ achụsịsị ndi mmadu. A chọpụtakwara na ha na-agba ndi a egbe. Mana ka ọ dị ugbu a, enwebeghi ndi nwụrụnụ.

Leave a Reply