Igbo News

RevolutionNow: Buhari agwaala ndi nkwado RevolutionNow ka ha gosi onwe ha

Views

Onyeisi ala Muhammed Buhari agwaala ndi na-akwado ‘RevolutionNow’ ka pụta gosi ọha obodo ndi ha bụ ka ndi Naijiria nwee ike mara ebe ha kwụ.

Onyeisi ala kwuru nke a na Sọnde ka ndi uwe ojii kpochichara Mz. Sowore Omoyele, dika onye nchikọta ndi na-ebute ọgbaaghara.

Buhari kwuru na ime ntụli bụ ụzọ kacha mma iji gbanwe gọọmenti ọ bụla. O kwuru na ọ bụ maka nke a ka o jiri wepụta onwe na Febụarị, wee zọọ ọchịchị n’okpuru pati APC ma merie.

Dika onyeisi ala, Buhari kwuru na onye ọ bụla nwere ikike ime ngaghari iwe n’udo, ma ịkpọ oku maka mgbanwe (revolution) ga-ebute ọgụ na mgba.  Otu a ka o kwuru:

‘O nwere ihe dị iche n’etiti ngaghari iwe na ime ka enwe mgbanwe. Ya mere, otu ọbụla na-akwado atụmatụ a gosi onwe ha ka ndi Naijiria mara n’aha onye a na-eme ya bụ ọgbaaghara’.

Buhari gara n’ihu gwa ndi nkwado a na ọ bụ mgbe ha pụtara, soro ndi mmadu mee ngaghari ka a ga-ama n’ezie na ha ezi ndi ndu.

Leave a Reply