FeaturedIgbo News

Reno Omokri enyerela onye ọkụ gbara ngwa ahịa ya n’Ọnitsha aka

Views

Onye enyemaka onyeisi ala Naijiria gara aga, Reno Omokri, chọtara onye ọkụ a gbara n’Ọnitsha ma nyere ya aka.

Dịka Reno Omokri kwuru n’igwe Twitter ya:

Ekele dịrị Chineke, a chọtala m ya. Aha ya bụ Uchechukwu Ukaekpu. Anyị kpọrọ ya site na ihe onyonyo ekwentị, iji kweta na ọ bụ ya.

Tụpụ Omokri achọta nwaamadi a, o dere site n’igwe Twitter ya ka ndị mmadu nyere ya aka chọta nwokorobịa ọ hụrụ na ihe eserese nke sị n’ọkụ ọgbụgba gbara n’Ọnitsha.

Ọ chọtara nwoke ma nyere ya aka site n’ịkwụnye ụgwọ n’akaụntụ ya. O kelekwara Osita Chidoka maka ego o tinyekwuru nan ye nwaamadi a.

Ọ gara n’ihu rịọ ndị Naijiria ka tinye aka zọpụta nwokorobia.

Lee ihe eserese a ebe a:

Leave a Reply