FeaturedIgbo News

Peter Arotiba, onye Naijiria a bụrụla onye kacha mee ọfụma na WASSCE

Views

Nwa Naijiria dị afọ iri na asatọ, Peter Arotiba, onye Kogi Steeti, enwetala nturu ugo‘National Distinction and Merit Award’ nke ndị West Africa Examination Council maka ị bụ onye kacha mee ọfụma n’ule nke 2018.

Arotiba bụ onye gara Nigeria Airforce Secondary n’Ikeja, Lagos Steeti.

E nyere ya nturu ugo a na mmepe nzukọ nke ndị Nigeria National Committee (NNC) nke WAEC n’Abuja, na Tuzde.

Ndị News Agency of Nigeria, kwuru na Arotiba nwetara ‘distinction’ na ule niile o lere.

Arotiba n’aka nke ọzọ kwuru na ọ bụ amara Chukwu na igbasi mbọ ike mere o jiri nọrọ n’ogo dị elu taa.

Leave a Reply