FeaturedIgbo CultureLifestylePhotography

Pedro Nwawunze: Nwokorobia maara ihe ekwe na-akụ n’ihe eserese

Views

Dịka obodo anyị na-arịa nsogbu nchekwa na ndi na-achị ehi, otu nwokorobia nọ na mpagharị ugwu, nke aha ya bụ Pedro Nwawunze na-akpa ike di egwu n’ebe ihe gbasara ihe eserese dị. O jirila aka ya kpaa mkpa mkpa n’akwụkwọ eji ese ihe nke ndi bekee na-akpọ canvas. Site n’echiche ya, o seela ọtụtụ ihe nke gbakwasiri ụkwụ n’ikpe na-ezighi ezi nakwa ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọ kpọrọ aha eserese ya  ‘THE ANCESTORAL

Pedro Nwawunze bụ nwaafọ Ikeduru nke dị n’Imo Steeti a mụrụ n’ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa Decemba, n’afọ 1988. O nwetara nzere B. A. ya na ngalaba Fine and Applied Arts n’ Institute of Management and Technology nke dị n’Enugu. Ọ bụ otu onye na ndi Society of Nigeria Artist (SNA), n’Abuja.

Pedro Nwawunze

Ka ọ dị ugbu a, Pedro abụrụla ọkachamara n’ihe gbasara eserese nke gunyere ihe ndi a ndi bekee na-akpọ: graffiti, chalkboard art, fabric design na ndi ọzọ. Ụfọdụ ọrụ ya bụ nke gbakwasiri ụkwụ na ihe na-eme na Naijiria. O jikwa ọrụ ya ebuso arụrụ ala na ikpe na-ezighi ezi agha n’obodo a.

Ndi Igbo na-asị na onye ọrụ ọ bụla nwere ụgwọ ọrụ. Otu a ka ọ dị na ndu nwokorobia. Pedro so na mmadu iri abụọ na ise ndi ahọrọ sonyere n’emume ‘Life in my City Art Festival’ n’afọ 2016.

O sonyekwara na Abuja Unlock Exhibition emere n’afọ 2017. Ọtụtụ ọrụ bụ nke ndi mmadu zụrụ. E nwekwara ọrụ ndi o ji n’aka ugbu a.

Ile anya ebe a, ị ga-ahụ ụfọdu ọrụ aka ya ọzọ:

 

 

Leave a Reply