Igbo News

PDP agwaala FG ka megharịa mkpebi ha maka VAT

Views

Ndi Peoples Democratic Party (PDP) agwala Gọọmentị Etiti ka ha megharịa mkpebi ha nke gbasara mbawanye pasentị Value Added Tax (VAT), nke si na 5% ruo 7.2%.

Mz. Kola Ologbondiyan, onye odee akwụkwọ PDP, kwuru na Tọzde n’Abuja na PDP jụrụ ụdị mkpebi a.

Ologbondiyan kwuru na ndi Naijiria agaghị ebuli ibu a n’ihi ọtụ ọnọdụ akụnaụba nke obodo a siri dị. O kwuru na mkpebi a gbasara mbawanye VAT abụghị atụtụ ziri ezi nyere ndi obodo.

Ọ gwara onyeisi ala Muhammadu Buhari na mbawanye VAT ga-etinye ọtụtụ ezinaụlọ na nsogbu nke ga-eme ka ebuli ọnụ ahịa a na-ere ihe.

Ologbodinyan kwuru na kama a ga-ebukwasa ndi Naijiria ibu arụ a, Buhari gaa napụta ego ruru puku ijeri naira iri na anọ (#14 trillion); ego mmanụ nke a kwuru na ndi mmadu zuru kemgbe afọ anọ gara aga.

Ndi PDP gwara ndi omeiwu ka ha kpuchite ndi Naijiria na zọkwa obodo a ka ọ ghara ịda, site n’ịjụ ajọ mkpebi a Buhari wepụtara.

Leave a Reply