Igbo News

Paracetamol egbuola Nwagbọghọ n’efe Naijiria n’Ekiti

Views

Otu nwagbọgho na-efe ala nna ya n’Ekiti Steeti a na-akpọ Oghomwen Omoruy Honour anwụọla n’egbughi oge ka o kwuru na isi na-awa ya.

Nwagbọghọbia bụ onye gụrụ Mass Communication n’Awuchi Polytechnic nwụrụ n’ụbọchị Mọnde iri abụọ na anọ nke ọnwa Juun, 2019.

Dika akụkọ kwuru, nwagbọghọbia ṅụrụ Paracetamol mgbe o kwuru n’isi na-awa ya. Ma o teghi aka ọ ṅụchara ọgwụ a, ihe bidoro sewe ya, o wee gbọọ ọfụfụ n’ọnụ. Ọ nwụrụ tụpụ eburu gawa ụlọ ọgwụ.

Honour bụ onye si Adamawa Steeti bia Ekiti Steeti ife ala nna ya.

Leave a Reply