Igbo News

Ọzọdimgba eloola nde naira asatọ na puku nari isii na Kano

Male Chimpanzee Portrait
Views

Onye na-elekọta ego n’ ebe a na-edebe ụmụanụmanụ, Kano ekwuola na ọzọdimgba batara n’ụlọ ọrụ ya wee buru ego dị ebe ahụ. O buru ego kariri nde nari isii wee loo ya. Ihe a mere n’oge a na-eme emume sallah.

Onye ntụziaka ebe a na-edobe ụmụanụmanụ gwara ndi nta akụkọ na o nweghi ihe ọ ga-ekwu karia na ego ahụ efuola nakwa na ha na-agba mbo ịchọpụta otu mmiri siri baa n’opi ụgbọgụrụ.

Onye na-ekwuchitere ndi uwe ojii okwu bụ Abdullahi Haruna ekwuola na akpọchiela mmadu iri nọ mgbe ego a furu.

Leave a Reply