FeaturedIgbo News

Ozi Mgbaru ‘Ọsa enwe Akwụ’ Obasanjo zigara maka ọnwụ Buruji Kashamu

Views

Onye rụbụrụ onyeisala Naịjiria bụ Chief Olusegun Obasanjo ezigarala gọvanọ Ogun steeti nakwa ndị be Kashamu ozi mgbaru maka ọnwụ onye nọchitebụrụ anya ndị Ogun East n’ụlọ omeiwu na 2015 bụ Buruji Kashamu.

Buruji Kashamu nwụrụ ka ọnwa Ọgọọstụ dị n’abalị asatọ n’afọ 2020. Buruji, onye nke a mụrụ n’afọ 1958 gbara afọ 62 were nwụ.

N’ozi nke ya, ọ kọwara mwute ya nyere ọnwụ Kashamu nke ọ kpọrọ Sen. Esho Jinadu, ma kọwaa ya dịka onye ji mpụ na aghụghọ gbanahụ ntaramahụhụ o kwesịrị ịnata dịka onye dara iwu obodo site n’ibu ọgwụ ike.

Obasanjọ dọrọ aka na ntị ma mee ka ndị ọchịchị ndị ọzọ mara na onweghi magomago mmadụ mekatara n’ụwa a ka ọ gbanahụ ọnwụ.

O mechara rịọ Allah ka ọ gbaghara Kashamu njọ ya niile ma nabata ya n’ Aljanah.

Ọ kasikwaziri ụmụnne Kashamu na gọvanọ Ogun steeti obi maka ọnwụ nwanne ha.

Gụọ:

4 Comments

Leave a Reply